Ezra 10

Nkwupụta mmehie

1Mgbe Ezra na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie ndị a, na-akwa akwa, na-atụ onwe ya nʼala nʼihu ụlọ Chineke, igwe ndị Izrel dị ukwuu, bụ ndị nwoke, na nwanyị, na ụmụntakịrị gbara ya gburugburu soro ya na-akwa akwa dị ilu. 2Mgbe ahụ, Shekanaya nwa Jehiel, onye agbụrụ Elam, sịrị Ezra, “Anyị emehiela megide Chineke anyị, nʼihi nʼịlụ ndị inyom mba ọzọ ndị gbara anyị gburugburu. Ma otu ọ dị, olileanya ka dịrị ndị Izrel. 3Ugbu a ka anyị gbaa ndụ nʼihu Chineke anyị, izilaga ndị inyom ndị mba ọzọ ndị a na ụmụ ha dịka ndụmọdụ onyenwe m Ezra, na ndị na-atụ egwu iwu Chineke anyị si dị. Ka e mee ihe ndị a dịka iwu si dị. 4Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.”

5Mgbe ahụ, Ezra biliri jụọ ndịisi ndị nchụaja na ndị Livayị, na Izrel niile, ma ha ga-eme ihe Shekanaya kwuru. Ha niile ṅụrụ iyi kwenye na ha ga-eme ya. 6Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.

7E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem. 8Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.

9Mgbe ụbọchị atọ ahụ zuru, ndị ikom Juda na Benjamin niile zukọrọ na Jerusalem. Nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa itoolu, mmadụ niile zukọrọ nọdụ nʼama dị nʼihu ụlọnsọ Chineke. Mmiri dị ukwuu zoro nʼụbọchị ahụ. Ụjọ tụkwara ndị ahụ niile zukọrọ nʼihi oke mmiri ozuzo ahụ na nʼihi okwu ahụ. 10Mgbe ahụ Ezra onye nchụaja, biliri ọtọ, sị ha, “Unu emehiela, nʼihi na unu lụrụ ndị inyom mba ọzọ, si otu a tụkwasị ihe nʼikpe ọmụma dịrị Izrel. 11Ugbu a, sọpụrụnụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna unu ha, meekwanụ ihe bụ nzube ya. Kewapụnụ onwe unu site nʼebe ndị mba ọzọ nọ, nakwa ebe nwunye ndị unu si mba ọzọ lụta.”

12Nzukọ niile ahụ zara nʼotu olu sị. “Okwu gị ziri ezi, Anyị aghaghị ime dịka i kwuru.” 13Ma ha zakwara sị, “Nke a abụghị ihe anyị ga-eme nʼotu ụbọchị maọbụ nʼụbọchị abụọ, nʼihi na aka ọtụtụ mmadụ nʼime anyị dị na mmehie ahụ. Mmiri na-ezosikwa ike, anyị enwekwaghị ike ịnọgide ruo oge dị anya. 14Ka ndịisi anyị guzobe mkpọkọta niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị ndị lụrụ nwanyị site na mba ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ha na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Chineke banyere okwu a sitere nʼebe anyị nọ pụọ.” 15Ma ndị na-ekweghị ka e mee ya otu a bụ naanị Jonatan nwa Asahel na Jazeia nwa Tikva, na Meshulam na Shabetai onye Livayị.

16Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a. 17Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ya bụ, nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ, ha rụchara ọrụ banyere ndị ikom lụrụ ndị inyom mba ọzọ.

Ndị lụrụ ndị mba ọzọ

18A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ.
Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ,
Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya.
19Ha niile jikọrọ aka kpebiekwa na ha ga-ezila ndị nwunye ha. Onye ọbụla wetara ebule site nʼigwe atụrụ dịka ihe ikpe ọmụma.
20Ndị si nʼikwu Imea bụ
Hanani, na Zebadaya.
21Ikwu Harim:
Maaseia, Ịlaịja, Shemaya, Jehiel na Uzaya.
22Ndị si nʼikwu Pashua:
Elioenai, Maaseia, Ishmel, Netanel, Jozabad, na Eleasa.

23Nʼime ndị Livayị:
Jozabad, Shimei, Kelaya (onye a na-akpọkwa Kelita), Petahaya, Juda na Elieza.
24Nʼime ndị na-abụ abụ,
Eliashib.
Nʼime ndị nche ọnụ ụzọ:
Shalum, Telem, na Uri.

25Nʼetiti ndị Izrel ndị ọzọ:
Site nʼikwu Parosh:
Ramaya, Izaya, Malkija, Mijamin, Elieza, Malkija na Benaya.
26Site nʼikwu Elam:
Matanaya, Zekaraya, Jehiel, Abdi, Jeremot na Ịlaịja.
27Site nʼikwu Zatu:
Elioenai, Eliashib, Matanaya, Jeremot, Zabad na Aziza.
28Site nʼikwu Bebai:
Jehohanan, Hananaya, Zabai, na Atlai.
29Site nʼikwu Bani,
Meshulam, Maluk, Adaya, Jashub, Sheal na Jeremot.
30Site nʼikwu Pahat-Moab,
Adna, Kelal, Benaya, Maaseia, Matanaya, Bezalel, Binui, na Manase.
31Site nʼikwu Harim:
Elieza, Ishija, Malkija, Shemaya, Shimeon,
32Benjamin, Maluk na Shemaraya.
33Site nʼikwu Hashum,
Matenai, Matata, Zabad, Elifelet, Jeremai, Manase na Shimei.
34Site nʼikwu Bani,
Maadai, Amram, Uel,
35Benaya, Bedeia, Keluhi 36Venaya, Meremot, Eliashib 37Matanaya, Matenai na Jaasu.
38Site nʼikwu Bani:
Binui na Shimei,
39Shelemaya, Netan, Adaya, 40Maknadebai, Shashai, Sharai, 41Azarel, Shelemaya, Shemaraya, 42Shalum, Amaraya na Josef.
43Site nʼikwu Nebo:
Jeiel, Matitaia, Zabad, Zebina, Jadai, Juel na Benaya.

44Ndị a niile lụrụ ndị inyom site na mba ọzọ. Ha zilagara ha na ụmụ ha.
Copyright information for IboBIU